Joshua 10

Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha.

Joshua 10:36 (UKJV) And Joshua went up from Eglon, and all Israel with him, unto Hebron; and they fought against it:

34Emesịa, nʼụbọchị ahụ kwa, Joshua na ndị Izrel hapụrụ Lakish gaa Eglọn lụgbuo ya.

35Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish.

36Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha.

37Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ.

38Joshua na ndị Izrel niile ya na ha so laghachiri azụ gaa busoo Debịa agha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.