Joshua 10

Ha meriri obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, na eze ya, jiri mma agha gbuchapụ ha niile, mmadụ niile nọ nʼime ya ka ha gburu kpamkpam. Ha ahapụghị onye ọbụla ndụ, ha mere Debịa na eze ya dịka ha mere Libna na eze ya, na Hebrọn kwa.

Joshua 10:39 (UKJV) And he took it, and the king thereof, and all the cities thereof; and they stroke them with the edge of the sword, and utterly destroyed all the souls that were therein; he left none remaining: as he had done to Hebron, so he did to Debir, and to the king thereof; as he had done also to Libnah, and to her king.

37Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ.

38Joshua na ndị Izrel niile ya na ha so laghachiri azụ gaa busoo Debịa agha.

39Ha meriri obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, na eze ya, jiri mma agha gbuchapụ ha niile, mmadụ niile nọ nʼime ya ka ha gburu kpamkpam. Ha ahapụghị onye ọbụla ndụ, ha mere Debịa na eze ya dịka ha mere Libna na eze ya, na Hebrọn kwa.

40Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu.

41Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen ruo Gibiọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.