Joshua 12

Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn. Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya.

Joshua 12:2 (UKJV) Sihon king of the Amorites, who dwelt in Heshbon, and ruled from Aroer, which is upon the bank of the river Arnon, and from the middle of the river, and from half Gilead, even unto the river Jabbok, which is the border of the children of Ammon;

1Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba.

2Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn. Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya.

3Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga.

4Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.