Joshua 12

Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.

Joshua 12:7 (UKJV) And these are the kings of the country which Joshua and the children of Israel stroke on this side Jordan on the west, from Baalgad in the valley of Lebanon even unto the mount Halak, that goes up to Seir; which Joshua gave unto the tribes of Israel for a possession according to their divisions;

5Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn.

6Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.

7Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.

8Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ndị a bụ ndị eze ahụ:

9Eze Jeriko, otu eze Ai (nke dị nso na Betel), otu

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.