8Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha.
9Ala ha gbatịrị site nʼAroea nke dị na ndagwurugwu Anọn, na site nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ, ruo nʼala dị larịị nke gbatịrị site na Medeba ruo Dibọn.
10Ọ gbatịkwara ruo nʼoke ala ndị Amọn, tinyere obodo niile nke Saịhọn, eze ndị Amọrait na-achị mgbe o bi na Heshbọn.
11Ọ gụnyekwara Gilead, nʼoke ala ndị Geshua, na ndị Maaka, na ugwu Hemon niile, na Bashan niile, ruokwa Saleka.
12Ya bụ, obodo niile nke Ọg eze ndị Bashan na-achị, mgbe isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. (Ọ bụ eze ikpeazụ nʼagbụrụ ndị Refaim.) Mosis busoro Saịhọn na Ọg agha, tigbuo ha, napụkwa ha ala ha.