Joshua 13

Ndị a bụ ala ebo Gad nwetara: ala ahụ niile dị na Jeza, na obodo Gilead niile, na ọkara ala ndị Amọn nke ruru Areoa, nʼakụkụ Raba.

Joshua 13:25 (UKJV) And their coast was Jazer, and all the cities of Gilead, and half the land of the children of Ammon, unto Aroer that is before Rabbah;

23Ya mere, oke ala ebo Ruben dị nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Obodo ukwu na obodo nta ndị a bụ ihe ha nwetara dịka ihe nketa ha. Ezinaụlọ ọbụla nwetakwara oke nke ha dịka ikwu ha si dị.

24Mosis nyekwara ebo Gad ala nke ha site nʼala ahụ ha lụgburu, dịka ikwu ha si dị.

25Ndị a bụ ala ebo Gad nwetara: ala ahụ niile dị na Jeza, na obodo Gilead niile, na ọkara ala ndị Amọn nke ruru Areoa, nʼakụkụ Raba.

26Na ala sitere Heshbọn ruo Ramat Mizpa, na Betonim, na sitekwa Mahanaim ruo oke ala Debịa.

27Nʼime ndagwurugwu ala ha bụ Bet-Haram, na Bet-Nimra, na Sukọt, na Zafọn, na ala fọdụrụ nʼalaeze Saịhọn eze Heshbọn, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼoke ala ya ruokwa nsọtụ osimiri Galili.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.