11M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa
12Ya mere, nye m ala ugwu ugwu ahụ Onyenwe anyị kwere m nkwa nʼụbọchị ahụ. Gị onwe gị nụrụ nʼoge ahụ na ụmụ Anak bi nʼebe ahụ, na obodo ha bukwara ibu, na e jikwa mgbidi e wusiri ike gbaa ha gburugburu. Ma site nʼinyeaka Onyenwe anyị, aga m achụpụ ha dịka Onyenwe anyị kwuru.”
13Nʼihi nke a, Joshua gọziri Kaleb nwa Jefune. O nyere ya obodo Hebrọn ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
14Ya mere, obodo Hebrọn ghọrọ ihe nketa Kaleb nwa Jefune onye Keniz bido mgbe ahụ, nʼihi na o ji obi ya niile soro Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
15Tupu oge a, aha a na-akpọ Hebrọn bụ Kiriat Aaba, nke pụtara Obodo Aaba. Aaba bụkwa aha nwoke kachasị ịdị ukwuu nʼetiti ndị Anak niile. Site nʼoge a gaa nʼihu, e nwere udo nʼala ahụ niile.