Joshua 17

Manase chịtara ala oke iri, tinyere Gilead, na Bashan nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan,

Joshua 17:5 (UKJV) And there fell ten portions to Manasseh, beside the land of Gilead and Bashan, which were on the other side Jordan;

3Ma Zelofehad, nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, amụtaghị ụmụ ndị ikom kama ọ mụtara naanị ụmụ ndị inyom, ndị aha ha bụ nke a: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza.

4Ndị inyom ndị a bịakwutere Elieza, onye nchụaja na Joshua nwa Nun, nʼihu ndị ndu ụmụ Izrel niile sị ha, “Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya kenye anyị ala nke anyị, dịka o si kenye ụmụ ndị ikom ikwu anyị.” Ya mere, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu, Joshua nyere ha ihe nketa ruuru ha nʼetiti ụmụnne nna ha, dịka ndị ọzọ si keta.

5Manase chịtara ala oke iri, tinyere Gilead, na Bashan nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan,

6nʼihi na e mere ka ndị inyom Manase keta oke nʼetiti ndị ikom ebo Manase. Ala fọdụrụ na Gilead bụ ndị ikom ebo Manase nwe ya.

7Oke ala ebo Manase gbatịrị site nʼAsha ruo na Mikmetat, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Shekem. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ndịda site nʼebe ahụ tinyere ndị bi nʼala En-Tapụọa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.