34Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.
35Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret,
36Adama, Rema, Hazọ,
37Kedesh, Edrei, En-Hazoa,
38Iron, Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh. Ya mere, ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri na itoolu, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.