Joshua 2

Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.

Joshua 2:23 (UKJV) So the two men returned, and descended from the mountain, and passed over, and came to Joshua the son of Nun, and told him all things that befell them:

21Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.” O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya.

22Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha.

23Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.

24Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.