1Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,
2na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “Onyenwe anyị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.”
3Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.