Joshua 22

Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.

Joshua 22:4 (UKJV) And now the LORD your God has given rest unto your brethren, as he promised them: therefore now return all of you, and get you unto your tents, and unto the land of your possession, which Moses the servant of the LORD gave you on the other side Jordan.

2“Unu emeela ihe niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu. Unu egeela ntị nʼolu m, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu.

3E, unu arụzuola ọrụ ahụ Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile.

4Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.

5Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu: nke bụ ịhụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe.”

6Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.