Joshua 23

“Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma Onyenwe anyị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị.

Joshua 23:14 (UKJV) And, behold, this day I am going the way of all the earth: and all of you know in all your hearts and in all your souls, that not one thing has failed of all the good things which the LORD your God spoke concerning you; all are come to pass unto you, and not one thing has failed thereof.

12“Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ,

13maranụ nke ọma, na Onyenwe anyị Chineke unu agaghị achụpụrụ unu mba ndị a site nʼala unu. Kama ha ga-abụrụ unu igbudu na ọnya. Ha ga-abụkwara unu apịpịa nʼakụkụ unu, na ogwu nʼanya unu, ruo mgbe unu ga-ala nʼiyi nʼezi ala a, nke Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.

14“Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma Onyenwe anyị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị.

15Ma dịka ezi nkwa niile Onyenwe anyị Chineke unu kwere si bụrụ ihe e mezuru emezu, otu a kwa ka Onyenwe anyị ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile ọ bara mba ya mezuo nʼisi unu, tutu ruo mgbe o mere ka unu laa nʼiyi nʼezi ala ahụ ọ na-enye unu.

16Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.