Joshua 24

Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke.

Joshua 24:1 (UKJV) And Joshua gathered all the tribes of Israel to Shechem, and called for the elders of Israel, and for their heads, and for their judges, and for their officers; and they presented themselves before God.

1Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke.

2Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe.

3Ma mụ onwe m kpọpụtara nna nna unu Ebraham site nʼala ahụ dị nʼofe osimiri dubata ya nʼala Kenan, nye ya ọtụtụ ụmụ ụmụ, site na nwa ya bụ Aịzik.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.