16Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ!
17Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee.
18Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”
19Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife Onyenwe anyị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile.
20Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.”