Joshua 3

Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.

Joshua 3:6 (UKJV) And Joshua spoke unto the priests, saying, Take up the ark of the covenant, and pass over before the people. And they took up the ark of the covenant, and went before the people.

4Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.”

5Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka Onyenwe anyị ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.”

6Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.

7Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.

8Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.