12Ọ bụ nʼihi nke a mere na ụmụ Izrel enwekwaghị ike iguzo nʼihu ndị iro ha. Ọ bụkwa nke a mere ha ji tụgharịa gbaa ọsọ, nʼihi na ha aghọọla ndị kwesiri ka e bibie. Ya mere, agaghị m anọnyere unu ọzọ, tutu ruo mgbe unu wezugara ma mebie site nʼetiti onwe unu, ihe ọbụla e debere iche maka mbibi.
13“Bilie! Doo Izrel nsọ. Gwa ndị m okwu sị ha, ‘Onye ọbụla nʼetiti unu ga-ejikere doo onwe ya nsọ maka echi. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu sị, Ihe ndị e doro nsọ dị nʼetiti unu, Izrel. Unu apụghịkwa iguzosi ike nʼihu ndị iro unu, tutu ruo mgbe unu ga-esite nʼetiti onwe unu wezuga ihe ndị ahụ.’
14“ ‘Nʼụtụtụ echi, unu ga-apụta nʼebo nʼebo. Ebo ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta nʼikwu nʼikwu, ikwu ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta bịa nʼezinaụlọ nʼezinaụlọ, ụlọ ọbụla nke Onyenwe anyị họọrọ, ndị ikom ya ga-apụta nʼotu nʼotu.
15Ma onye ọbụla e jidere ji ihe ndị ahụ e doro nsọ ka a ga-akpọ ọkụ, ya onwe ya, na ihe niile ọ nwere, nʼihi o mebiela iwu ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, meekwa ihe jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel.’ ”
16Nʼihi nke a, Joshua biliri nʼisi ụtụtụ. O mere ka ebo niile dị nʼIzrel bịaruo nso nʼebo nʼebo, ebo Juda ka a họọrọ.