Joshua 8

Izrel niile, ha na ndị okenye ha, na ndị ọchịagha ha, na ndị ikpe ha, guzo nʼakụkụ abụọ nke igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ncherita ihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị ndị na-ebu ya. Ma ndị ọbịa bi nʼetiti ha, ma ndị amụrụ nʼala ahụ nọ nʼebe ahụ. Ọkara nʼime ha gara guzo nʼakụkụ ugwu Gerizim, ọkara ndị ọzọ guzoro nʼakụkụ ugwu Ebal, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu na mbụ, na ha ga-agọzi ndị Izrel.

Joshua 8:33 (UKJV) And all Israel, and their elders, and officers, and their judges, stood on this side the ark and on that side before the priests the Levites, which bare the ark of the covenant of the LORD, as well the stranger, as he that was born among them; half of them opposite to mount Gerizim, and half of them opposite to mount Ebal; as Moses the servant of the LORD had commanded before, that they should bless the people of Israel.

31dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu. O wuru ya dịka ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis si dị, ebe ịchụ aja a na-ejighị nkume a wara awa wuo, nkume a na-ejighị ngwa ọrụ igwe waa. Nʼelu ebe ịchụ aja a ka ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ na aja udo.

32Ma mgbe ndị Izrel nọ na-ele anya, Joshua depụtara iwu ndị ahụ Mosis nyere ha nʼelu nkume.

33Izrel niile, ha na ndị okenye ha, na ndị ọchịagha ha, na ndị ikpe ha, guzo nʼakụkụ abụọ nke igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ncherita ihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị ndị na-ebu ya. Ma ndị ọbịa bi nʼetiti ha, ma ndị amụrụ nʼala ahụ nọ nʼebe ahụ. Ọkara nʼime ha gara guzo nʼakụkụ ugwu Gerizim, ọkara ndị ọzọ guzoro nʼakụkụ ugwu Ebal, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu na mbụ, na ha ga-agọzi ndị Izrel.

34Emesịa, Joshua gụpụtara na ntị ha, okwu niile nke iwu ahụ, ya na ngọzị na ọbụbụ ọnụ so ya, dịka ihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu si dị.

35Iwu niile Mosis nyere ha ka Joshua gụpụtara na ntị ndị Izrel niile. Ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa niile bi nʼetiti ụmụ Izrel so nọkọọ nʼoge a ndị Izrel niile zukọrọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.