Joshua 9

Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.”

Joshua 9:20 (UKJV) This we will do to them; we will even let them live, lest wrath be upon us, because of the oath which we swore unto them.

18Ma ndị Izrel ebusoghị ha agha nʼihi na ndịisi nzukọ Izrel ejirila aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel ṅụọ iyi idebe ha ndụ. Ma nzukọ Izrel niile tamuru ntamu megide ndịisi ha nʼihi ọgbụgba ndụ a.

19Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla.

20Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.”

21Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ.

22Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.