Joshua 9

Nʼihi nke a, Joshua ekweghị ka ndị Izrel gbuo ha.

Joshua 9:26 (UKJV) And so did he unto them, and delivered them out of the hand of the children of Israel, that they slew them not.

24Ha zara Joshua sị, “Anyị mere nke a nʼihi na agwala anyị na Onyenwe anyị Chineke gị nyere Mosis iwu sị ya merie ala ndị a niile, ma kpochapụ ndị niile bi nʼime ya. Ọ bụ nke a mere ụjọ ji tụọ anyị. Ọ bụkwa ya mere anyị ji mee ihe dị otu a, nʼihi ichebe ndụ anyị.

25Ma ugbu a, anyị dị unu nʼaka. Unu nwere ike ime anyị ihe dị unu mma.”

26Nʼihi nke a, Joshua ekweghị ka ndị Izrel gbuo ha.

27Joshua mere ha ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri nye ụmụ Izrel, na ịhụkwa banyere ihe ndị dị mkpa nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ bụkwa nke a ka ha bụ ruo taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.