Ndị Ikpe 1

Ọzọkwa, ndị ebo Asha achụpụghị ndị niile bi nʼAkọ, na Saịdọn, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, maọbụ Rehob.

Judges 1:31 (UKJV) Neither did Asher drive out the inhabitants of Accho, nor the inhabitants of Zidon, nor of Ahlab, nor of Achzib, nor of Helbah, nor of Aphik, nor of Rehob:

29Ifrem enwekwaghị ike chụpụ ndị Kenan bi na Gaza. Ndị Kenan gara nʼihu biri nʼetiti ha nʼebe ahụ.

30Otu a kwa, ebo Zebụlọn achụpụghị ndị Kenan bi nʼala Kitrọn, maọbụ na Nahalol, kama ha mere ha ndị ohu na-arụ ọrụ ike.

31Ọzọkwa, ndị ebo Asha achụpụghị ndị niile bi nʼAkọ, na Saịdọn, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, maọbụ Rehob.

32Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha.

33Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.