Ndị Ikpe 13

Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.”

Judges 13:18 (UKJV) And the angel of the LORD said unto him, Why ask you thus after my name, seeing it is secret?

16Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ Onyenwe anyị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị.

17Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?”

18Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.”

19Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, Onyenwe anyị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya:

20Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi Onyenwe anyị wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.