Ndị Ikpe 13

Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.”

Judges 13:8 (UKJV) Then Manoah implored the LORD, and said, O my Lord, let the man of God which you did send come again unto us, and teach us what we shall do unto the child that shall be born.

6Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya.

7Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’ ”

8Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.”

9Chineke zara ekpere ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutekwara nwunye Manoa mgbe ọ nọ nʼubi; maọbụ naanị ya nọ, di ya anọghị ya.

10Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.