9Ndị Filistia gara maa ụlọ ikwu ha nʼala Juda, gbasaa nʼala ahụ ruo obodo Lehi.
10Ndị Juda jụrụ ajụjụ sị ha; “Ọ bụ gịnị mere unu ji bịa nʼebe a ibuso anyị agha?” Ha zara sị, “Anyị na-achọ ijide Samsin, ka anyị megwara ya ihe ọjọọ o mere anyị.”
11Nʼihi nke a, ndị Juda zipụrụ puku ndị agha ka ha gaa jide Samsin nʼọgba nkume ahụ nke Etam. Ndị a bịara jụọ Samsin ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Ọ bụ na ị maghị na ndị Filistia na-achị obodo anyị?” Samsin zara sị ha, “Ihe m mere bụ imegwata ha ihe ha mere m.”
12Ha sịrị ya, “Anyị abịala ka anyị kee gị agbụ, dọkpụrụ gị, nye nʼaka ndị Filistia.” Samsin sịrị ha, “Ṅụọrọnụ m iyi na unu agaghị eji aka unu gbuo m.”
13Ha zara sị ya, “Anyị agaghị egbu gị kama anyị ga-eke gị agbụ.” Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya jekwuru ndị Filistia.