Ndị Ikpe 15

Samsin sịrị ha, “Nʼoge a, o ziri m ezi ị bọkwara ọbọ nʼebe ndị Filistia nọ.” Aghaghị m imesi ha ike.

Judges 15:3 (UKJV) And Samson said concerning them, Now shall I be more blameless than the Philistines, though I do them a displeasure.

1Mgbe oge nta gasịrị, nʼoge owuwe ihe ubi, mgbe a na-aghọ ọka, Samsin weere nwa ewu nta, gaa ileta nwunye ya. O gwara nna nwunye ya sị, “Ana m aga nʼọnụụlọ nwunye m.” Ma nna nwunye ya ekweghị ka ọ banye.

2Nna ya sịrị, “O doro m anya na ị kpọrọ nwa m nwanyị asị, ọ bụ nʼihi nke a ka m jiri kenye ya enyi gị nwoke ka ọ bụrụ nwunye ya. Nwanne ya nwanyị nke nta, ọ maghị mma karịa ya? Kpọrọ ya ka ọ nọchie anya ya.”

3Samsin sịrị ha, “Nʼoge a, o ziri m ezi ị bọkwara ọbọ nʼebe ndị Filistia nọ.” Aghaghị m imesi ha ike.

4Ya mere, Samsin pụrụ gaa jide narị nkịta ọhịa atọ, wetakwa ọwa ụfọdụ. O kekọtara ọdụdụ ha abụọ abụọ. O kenyere ọwa nʼagbata otu nkịta ọhịa na ibe ya.

5Emesịa, ọ mụnyere ọkụ nʼọwa ahụ niile. O mekwara ka nkịta ọhịa ndị ahụ dọkpụrụ ọwa a mụnyere ọkụ baa nʼubi ọka ndị Filistia, si otu a rechapụ ọka niile guzoro eguzo nʼubi, na ubi vaịnị niile, ha na osisi oliv niile ọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.