Ndị Ikpe 16

Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya okwu sị, “Olee ka i si kwuo na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọ bụ na i nweghị ike ịgwa m ihe dị gị nʼobi? Lee, ugbo atọ ndị a, i mere m ka m dịka onye nzuzu, ma ị gwabeghị m ebe ike gị dị ruo ugbu a.”

Judges 16:15 (UKJV) And she said unto him, How can you say, I love you, when yours heart is not with me? you have mocked me these three times, and have not told me wherein your great strength lies.

13Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya sị, “Lee, ị na-eme ka abụ m onye nzuzu, ghaara m ụgha. Gwa m eziokwu, otu a ga-esi kee gị agbụ.” Samsin zara sị ya, “Lee, e kewara agịrị isi dị m nʼisi ụzọ asaa, i were ụzọ nkekọta asaa e kekọtara agịrị isi m, kpanyekọtaa ha nʼihe i ji ekwe akwa, were ntu osisi i ji akpachi akwa kpachie ya, mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.” Mgbe Samsin rahụrụ ụra, Delaịla weere agịrị isi Samsin kpanyekọtaa ya nʼihe o ji ekwe akwa.

14O jikwa ǹtu osisi o ji akpachi akwa, kpachikọtasie agịrị isi Samsin ike. Ọzọ, Delaịla sịrị ya, “Samsin, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin bilitere nʼike fokọrọ ǹtu osisi ahụ, na ihe eji akpa akwa, na akwa akpara akpa.

15Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya okwu sị, “Olee ka i si kwuo na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọ bụ na i nweghị ike ịgwa m ihe dị gị nʼobi? Lee, ugbo atọ ndị a, i mere m ka m dịka onye nzuzu, ma ị gwabeghị m ebe ike gị dị ruo ugbu a.”

16Delaịla sikwara otu a nyegide Samsin nsogbu tutu ruo mgbe Samsin na-enweghịkwa ike ịnagide nsogbu ya.

17Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.