Ndị Ikpe 16

A gwara ndị Gaza sị, “Samsin nọ nʼobodo a.” Nʼihi ya, ha gbara ebe ahụ gburugburu ma nọdụ na-eche nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ abalị niile. Ọ dịghị ihe ha mere nʼabalị ahụ nʼihi na ha zubere sị, “Mgbe chi bọrọ, anyị ga-egbu ya.”

Judges 16:2 (UKJV) And it was told the Gazites, saying, Samson has come here. And they compassed him in, and laid wait for him all night in the gate of the city, and were quiet all the night, saying, In the morning, when it is day, we shall kill him.

1Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị.

2A gwara ndị Gaza sị, “Samsin nọ nʼobodo a.” Nʼihi ya, ha gbara ebe ahụ gburugburu ma nọdụ na-eche nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ abalị niile. Ọ dịghị ihe ha mere nʼabalị ahụ nʼihi na ha zubere sị, “Mgbe chi bọrọ, anyị ga-egbu ya.”

3Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu.

4Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.