29Mgbe ahụ, Samsin jidesiri ogidi abụọ dị nʼetiti ụlọ ahụ aka ike, aka nri ya nʼotu, aka ekpe ya na nke ọzọ.
30Samsin kpere ekpere sị, “Ka m soro ndị Filistia nwụọ!” O ji ike ya niile nuo ogidi ahụ aka. Otu mgbe ahụ kwa, ụlọ arụsị ahụ dara, dakwasị ndịisi ọchịchị Filistia ndị ahụ, na ndị niile nọ nʼime ụlọ ahụ. Ya mere, ndị niile so Samsin nwụọ nʼoge ahụ dị ọtụtụ karịa ndị Samsin gburu mgbe ọ dị ndụ.
31Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụnna ndị ikom Samsin, na ndị ezinaụlọ nna ya bịara nʼebe ahụ, buru ozu ya. Ha liri ya nʼagbata Zora na Eshtaol, ebe e liri nna ya Manoa. Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ.