Ndị Ikpe 18

Ụmụ Dan chịịrị arụsị ahụ niile Maịka mere, durukwa onye nchụaja ya gawa nʼobodo Laish, obodo nọ nʼudo, nke na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha busoro ndị obodo ahụ agha, suo obodo ahụ ọkụ.

Judges 18:27 (UKJV) And they took the things which Micah had made, and the priest which he had, and came unto Laish, unto a people that were resting and secure: and they stroke them with the edge of the sword, and burnt the city with fire.

25Ndị ikom Dan zara sị ya, “Lezie anya kpachara anya banyere ụdị okwu ị na-ekwu. Nʼihi na i kwuo ụdị okwu a gaa nʼihu, ụfọdụ ndị ikom isi na-anụ ọkụ ga-abịa lụso gị agha gbuo gị na ndị ezinaụlọ gị.”

26Ya mere, ndị ebo Dan gbara ya nkịtị na-aga ebe ha na-aga. Mgbe Maịka hụrụ na ha dị ọtụtụ karịa ya, ọ hapụrụ ha, tụgharịa laghachi nʼụlọ ya.

27Ụmụ Dan chịịrị arụsị ahụ niile Maịka mere, durukwa onye nchụaja ya gawa nʼobodo Laish, obodo nọ nʼudo, nke na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha busoro ndị obodo ahụ agha, suo obodo ahụ ọkụ.

28Ọ dịghị onye ọbụla nwere ike bịa inyere ndị obodo ahụ aka nʼihi ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo Saịdọn. O nwekwaghị obodo ọbụla ha na ha na-emekọrịta. Obodo a dị na ndagwurugwu dị nso na Bet-Rehob. Emesịa, ndị ebo Dan wughachiri obodo ahụ ọzọ, biri nʼime ya.

29Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ aha obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna ha ochie, onye bụ nwa Izrel. Ma tupu ebo Dan ebibie ya, aha obodo a nʼoge gara aga bụ Laish.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.