Ndị Ikpe 19

Mgbe agadi nwoke a hụrụ ndị ije ahụ na mbara ama obodo ahụ, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ebee ka unu si bịa? Ebee ka unu na-aga?”

Judges 19:17 (UKJV) And when he had lifted up his eyes, he saw a travelling man in the street of the city: and the old man said, Where go you? and whence come you?

15Nʼebe ahụ ka ha kwụsịrị ịnọ ọnọdụ abalị. Ha gara nọrọ na mbara ama obodo ahụ, ma o nweghị onye ọbụla kpọbatara ha ka ha rahụ ụra nʼụlọ ya.

16Nʼanyasị ahụ, otu agadi nwoke zutere ha ka o si ịrụ ọrụ nʼubi na-alọghachi, onye si nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, ma o bi ka onye ọbịa na Gibea (ndị bi nʼebe a bụ ndị Benjamin).

17Mgbe agadi nwoke a hụrụ ndị ije ahụ na mbara ama obodo ahụ, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ebee ka unu si bịa? Ebee ka unu na-aga?”

18Nwoke ahụ zara sị ya, “Anyị si Betlehem dị na Juda na-alọghachi nʼụlọ anyị dị nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Esi m ebe ahụ gaa Betlehem dị na Juda, ma ugbu a, ana m aga nʼụlọ Onyenwe anyị. O nweghị onye kpọbatara anyị nʼụlọ ya.

19Anyị nwere ihe oriri nke ịnyịnya ibu anyị ga-eri, achịcha na mmanya nke anyị bụ ndị ohu gị ga-eri, ya bụ, mụ onwe m na ohu gị nwanyị na nwokorobịa so anyị. Anyị achọghị ihe ọbụla nʼaka onye ọbụla.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.