Ndị Ikpe 19

Mgbe ọ bịaruru obodo ya, ọ banyere nʼụlọ ya wepụta mma jiri ya bọwaa ozu iko ya nwanyị ahụ ụzọ iri na abụọ. O zigaara ebo iri na abụọ niile dị nʼIzrel otu ụzọ, otu ụzọ.

Judges 19:29 (UKJV) And when he was come into his house, he took a knife, and laid hold on his concubine, and divided her, together with her bones, into twelve pieces, and sent her into all the coasts of Israel.

27Mgbe nwoke ahụ biliri nʼụtụtụ, meghee ụzọ ka ọ malite ije ya, ọ hụrụ iko ya nwanyị ahụ ka ọ tọgbọ nʼọnụ ụzọ ahụ. Aka ya abụọ dịkwa nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ ahụ.

28Nwoke ahụ kpọkuru ya sị ya, “Ngwa, bilie ka anyị laa.” Ma nwaagbọghọ ahụ ekwughị okwu ọbụla. Nwoke ahụ buliri ya, tụkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya laa nʼobodo nke aka ya.

29Mgbe ọ bịaruru obodo ya, ọ banyere nʼụlọ ya wepụta mma jiri ya bọwaa ozu iko ya nwanyị ahụ ụzọ iri na abụọ. O zigaara ebo iri na abụọ niile dị nʼIzrel otu ụzọ, otu ụzọ.

30Nʼihi nke a, Onye ọbụla hụrụ ihe ọjọọ a kwuru sị, “O nwebeghị onye ọbụla mere ụdị ajọ omume dị otu a kemgbe ụmụ Izrel si nʼobodo Ijipt pụta. Chee echiche banyere ihe a. Tulee ya ma gwa anyị ihe anyị ga-eme?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.