Ndị Ikpe 20

Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu?

Judges 20:12 (UKJV) And the tribes of Israel sent men through all the tribe of Benjamin, saying, What wickedness is this that is done among you?

10Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.”

11Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ.

12Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu?

13Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.” Ma ụmụ Benjamin egeghị ndị Izrel ibe ha ntị.

14Ha sitere nʼobodo ha dị iche iche zukọtaa na Gibea maka ibuso ndị Izrel agha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.