Ndị Ikpe 21

Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha.

Judges 21:12 (UKJV) And they found among the inhabitants of Jabeshgilead four hundred young virgins, that had known no man by lying with any male: and they brought them unto the camp to Shiloh, which is in the land of Canaan.

10Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na Jebesh Gilead, ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị.

11Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.”

12Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha.

13Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo.

14Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.