Ndị Ikpe 21

Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu.

Judges 21:15 (UKJV) And the people repented them for Benjamin, because that the LORD had made a breach in the tribes of Israel.

13Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo.

14Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile.

15Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu.

16Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala?

17Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.