Ndị Ikpe 21

Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’

Judges 21:18 (UKJV) Nevertheless we may not give them wives of our daughters: for the children of Israel have sworn, saying, Cursed be he that gives a wife to Benjamin.

16Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala?

17Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ.

18Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’

19Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.”

20Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.