20Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ,
21ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu.
22Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ”
23Ya mere, ndị Benjamin mere dịka ndụmọdụ e nyere ha si dị. Onye ọbụla nʼime ha jidere otu nwaagbọghọ nʼike mgbe ha na-ete egwu nʼoge mmemme ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ha lara nʼihe nketa ha, wughachi obodo ha, biri nʼime ya.
24Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ Izrel laghachiri nʼobodo ha, nʼotu nʼotu, onye ọbụla kwa laghachiri nʼebo ya, nʼikwu ya, nʼihe nketa nke aka ya.