Ndị Ikpe 3

O bunyere Eglọn, eze Moab ego ụtụ ahụ. Eglọn bụ nwoke buru oke ibu.

Judges 3:17 (UKJV) And he brought the present unto Eglon king of Moab: and Eglon was a very fat man.

15Ma mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị banyere ọnọdụ ọjọọ ha, o zitere ha onye nzọpụta. Aha nwoke ahụ bụ Ehud, nwa Gera, onye sitere nʼagbụrụ Benjamin. Ọ bụ onye na-eme aka ekpe. Ya onwe ya bụkwa onye na-ebugara Eglọn, eze Moab, ego ụtụ niile ụmụ Izrel na-atụ kwa afọ.

16Tupu ọ malite ije ya, o buru ụzọ kwadebere onwe ya mma agha nwere ihu abụọ na nzuzo. Ogologo mma ahụ ga-eru ihe dịka site nʼọnụ mkpịsịaka ruo nʼisi mbụ aka. Ehud kekwasịrị mma ahụ nʼapata ụkwụ aka nri ya, yikwasị ya uwe mwụda ya.

17O bunyere Eglọn, eze Moab ego ụtụ ahụ. Eglọn bụ nwoke buru oke ibu.

18Mgbe Ehud nyesịrị eze Eglọn ego ụtụ ahụ o ji bịa, o zilagara ndị butere ego ahụ.

19Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.” Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.