Ndị Ikpe 3

Ehud tinyere aka ekpe ya nʼime uwe ya, mịpụta mma ahụ nwere ihu abụọ nke o kegidere nʼapata ụkwụ aka nri ya. O weere ya mapuo eze Eglọn afọ.

Judges 3:21 (UKJV) And Ehud put forth his left hand, and took the dagger from his right thigh, and thrust it into his belly:

19Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.” Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo.

20Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ,

21Ehud tinyere aka ekpe ya nʼime uwe ya, mịpụta mma ahụ nwere ihu abụọ nke o kegidere nʼapata ụkwụ aka nri ya. O weere ya mapuo eze Eglọn afọ.

22Ọ bụladị isi mma ahụ sooro ihu mma ahụ mibanye nʼime afọ ukwu eze Eglọn. Ọnụ mma ahụ pụtakwara nʼazụ eze ahụ. Ehud amịpụtaghị mma ahụ, kama abụba dị nʼafọ eze ahụ kpuchiri ya.

23Ya mere, Ehud pụrụ nʼezi, mechibido ya ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼọnụụlọ elu ahụ, kpọchie ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.