Ndị Ikpe 3

Ma mgbe oge dị anya gasịrị ma eze apụtaghị, ha enweghị ike ijide onwe ha ọzọ. Ha weere ọtụghe ụzọ tụghee ọnụ ụzọ ahụ, hụ ebe eze ha tọgbọrọ nʼala, nwụọ.

Judges 3:25 (UKJV) And they tarried till they were ashamed: and, behold, he opened not the doors of the parlour; therefore they took a key, and opened them: and, behold, their lord was fallen down dead on the earth.

23Ya mere, Ehud pụrụ nʼezi, mechibido ya ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼọnụụlọ elu ahụ, kpọchie ha.

24Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịara chọọ ịbanye nʼụlọ ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ahụ akpọchi, ha kwuru nʼonwe ha sị, “Ọ ga-abụ na ọ na-anyụ nsị nʼụlọ mposi.”

25Ma mgbe oge dị anya gasịrị ma eze apụtaghị, ha enweghị ike ijide onwe ha ọzọ. Ha weere ọtụghe ụzọ tụghee ọnụ ụzọ ahụ, hụ ebe eze ha tọgbọrọ nʼala, nwụọ.

26Mgbe ahụ ha nọ na-eche, Ehud gbapụrụ. O sitere nʼebe ahụ arụsị ndị ahụ a pịrị apị dị gbafee, gbaga Seira.

27Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.