1Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka ndị Midia afọ asaa.
2Nʼihi na ndị Midia mekpara ha ahụ nke ukwuu, ụmụ Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu, nʼime ọgba nkume, na nʼebe e wusiri ike dị iche iche.
3Mgbe ọbụla ndị Izrel ghasịrị mkpụrụ nʼubi ha, ndị Midia, ndị Amalek na ụfọdụ ndị ọzọ si nʼọwụwa anyanwụ na-abịa buso ha agha.