Ndị Ikpe 6

Gidiọn sịrị Chineke, “Ọ bụrụ nʼezie na ị ga-azọpụta Izrel site nʼaka m dịka i kwere na nkwa,

Judges 6:36 (UKJV) And Gideon said unto God, If you will save Israel by mine hand, as you have said,

34Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Gidiọn. Ọ fụrụ opi ike nke o ji kpọkọta ndị agha ka ha zukọọ. Ndị agha niile si nʼikwu Abieza pụkwutere ya.

35Otu aka ahụ, o zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru ndị agha ndị Manase, na nke ndị Asha, na nke ndị Zebụlọn, na nke ndị Naftalị, ịkpọ ha ka ha bịa soro ya gaa ibu agha. Ha niile kwenyere pụkwute ya maka agha ahụ.

36Gidiọn sịrị Chineke, “Ọ bụrụ nʼezie na ị ga-azọpụta Izrel site nʼaka m dịka i kwere na nkwa,

37lee, aga m edebe ajị anụ nʼebe ịzọcha ọka. Ọ bụrụ na igirigi adakwasị naanị nʼelu ajị anụ ahụ ma ala ebe ọ tọgbọ gbakọọ agbakọ, mgbe ahụ aga m amata na ị ga-anapụta Izrel site nʼaka m, dịka ị kwuru.”

38Ihe a mezukwara dịka Gidiọn si rịọọ ya. Mgbe chi bọrọ, ọ gara welite ajị anụ ahụ chọpụta na o jupụtara na mmiri. Mmiri o si na ya pịpụta juru otu efere miri emi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.