Ndị Ikpe 8

Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ.

Judges 8:13 (UKJV) And Gideon the son of Joash returned from battle before the sun was up,

11Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha.

12Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile.

13Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ.

14Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ.

15Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.