20O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha.
21Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’ ” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu.
22Mgbe ahụ, ndị Izrel gwara Gidiọn sị ya, “Bịa ka ị bụrụ eze anyị! Gị na ụmụ gị ndị ikom, na ezinaụlọ gị niile, ga-abụ ndị ga-achị, nʼihi na ị gbapụtala anyị site nʼaka usuu ndị agha Midia.”
23Ma Gidiọn gwara ha okwu sị, “Mụ onwe m na ụmụ m agaghị abụ eze unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ eze unu.”
24Ọ sịrị, “Enwere m otu arịrịọ m ga-arịọ unu. Onye ọbụla nʼime unu nye m ọlantị site nʼoke unu nwetara site nʼihe nkwata nʼagha.” (Ọ bụ omenaala ndị Ishmel niile iyi ọlantị ọlaedo.)