4Nʼoge a, Gidiọn gabigara, gafee osimiri Jọdan, ya na narị ndị agha atọ so ya. Ike gwụrụ ha nke ukwuu ma ha nọgidere na-achụsi ndị iro ha ọsọ ike.
5Ọ sịrị ndị ikom Sukọt, “Nyetụnụ ndị agha m achịcha nʼihi na ike gwụrụ ha. Ana m na-achụso Zeba na Zalmuna, ndị eze Midia ọsọ.”
6Ma ndịisi Sukọt sịrị, “Anyị ga-esi aṅaa nye ndị agha gị achịcha? Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị?”
7Mgbe ahụ, Gidiọn zaghachiri, “Nʼihi nke a, mgbe Onyenwe anyị nyefere m Zeba na Zalmuna nʼaka, aga m eji ogwu na ụga na-epu nʼọzara dọkasịa unu ahụ.”
8O sitere nʼebe ahụ gaa Peniel rịọkwaa ndị obodo ahụ otu arịrịọ ahụ. Ma otu ụdị ọsịsa ahụ ndị Sukọt nyere ka ndị Peniel nyekwara.