15“Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na Lebanọn!’
16“Ugbu a, omume unu o ziri ezi ma sitekwa nʼezi obi na unu mere Abimelek eze? Mmeso unu mesoro Jerub-Baal na ezinaụlọ ya o ziri ezi? Unu omesoro ya dịka o kwesiri ya?
17Chetakwanụ na nna m lụrụ ọgụ maka unu, kpọọ ndụ ya ihe efu, nʼihi ịnapụta unu site nʼaka ndị Midia.
18Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu.
19Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ.