18Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu.
19Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ.
20Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.”
21Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya.
22Mgbe ọ gasịrị afọ atọ Abimelek bidoro ịchị Izrel,