22Mgbe ọ gasịrị afọ atọ Abimelek bidoro ịchị Izrel,
23Chineke kpaliri iro dị ukwuu nʼetiti Abimelek na ndị nwe obodo Shekem, nke bụ na ha mere omume ihu abụọ megide Abimelek.
24Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ Jerub-Baal asaa ahụ nʼisi Abimelek, na ndị Shekem ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya.
25Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme.
26Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ.