45Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile.
46Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit.
47Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ,
48ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.”
49Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro Abimelek. Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu Shekem, nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ.