1Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya kpuchie ada Zayọn! O sitela nʼeluigwe tụda ịma mma Izrel nʼala, o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya, nʼụbọchị iwe ya.
2Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb; na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ. O sitela nʼoke iwe ya dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda. Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala, mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ.
3O sitela nʼoke iwe ya bipụ ike niile Izrel nwere. O seghachiri aka nri ya, mgbe ndị iro ha na-abịa nso. O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya.