11o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
12Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
13O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.
14Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
15O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.